21Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya; ọkụ ya repịara Jekọb, iwe ọkụ ya biliri megide Izrel.
22Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke, maọbụ tụkwasị obi na nzọpụta ya.
23Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
24O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.
25Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.