23Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
24O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.
25Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.
26O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda.
27O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri.