Abụ Ọma 78

O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda.

Psalm 78:26 (UKJV) He caused an east wind to blow in the heaven: and by his power he brought in the south wind.

24O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.

25Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.

26O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda.

27O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri.

28O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.