34Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya; ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike.
35Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta.
36Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha.
37Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya.
38Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.