32Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha, jụkwa ikwere nʼọrụ ebube niile Onyenwe anyị rụrụ.
33O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu. O mekwara ka afọ ha gwụsịa nʼobi ọlụlọ mmiri.
34Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya; ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike.
35Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta.
36Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha.