38Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.
39Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke, chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.
40Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
41Mgbe mgbe, ha nwara Chineke; ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe.
42Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha;