40Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
41Mgbe mgbe, ha nwara Chineke; ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe.
42Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha;
43nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt, ọrụ ebube ya niile nʼọhịa Zoan.
44O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara. Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha.