44O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara. Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha.
45O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha, zitekwa awọ nʼala ha, nke bibiri ha.
46O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha, zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi.
47O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha, jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile.
48O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri, werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe.