57Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma.
58Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya.
59Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam.
60Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.
61O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka.