59Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam.
60Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.
61O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka.
62O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya.
63Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha;