4Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.
5O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ?
6Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị dịka Chineke oke iwe gị, bụ alaeze niile ndị ahụ na-adịghị akpọku aha gị;
7nʼihi na ha eripịala Jekọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.
8Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.