Abụ Ọma 79

nʼihi na ha eripịala Jekọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.

Psalm 79:7 (UKJV) For they have devoured Jacob, and laid waste his dwelling place.

5O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ?

6Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị dịka Chineke oke iwe gị, bụ alaeze niile ndị ahụ na-adịghị akpọku aha gị;

7nʼihi na ha eripịala Jekọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.

8Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.

9Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.