Abụ Ọma 79

Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.

Psalm 79:8 (UKJV) O remember not against us former iniquities: let your tender mercies speedily prevent us: for we are brought very low.

6Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị dịka Chineke oke iwe gị, bụ alaeze niile ndị ahụ na-adịghị akpọku aha gị;

7nʼihi na ha eripịala Jekọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.

8Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.

9Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị.

10Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ, na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.