9Ị sụchaara ya ala, mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.
10Ndo ya kpuchiri ugwu niile, alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida.
11Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri wasaakwa ume ya ruo osimiri.
12Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya?
13Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya, ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.