11Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri wasaakwa ume ya ruo osimiri.
12Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya?
13Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya, ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.
14Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a,
15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.