13Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya, ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.
14Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a,
15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.
16E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya; mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi.
17Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.