15mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.
16E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya; mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi.
17Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.
18Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.
19Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike zọpụta anyị.