6I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị, ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị.
7O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
8I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị; ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya.
9Ị sụchaara ya ala, mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.
10Ndo ya kpuchiri ugwu niile, alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida.