9Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ.
10Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya.
11“Ma ndị m ekweghị ige m ntị. Izrel emekwaghị dịka m gwara ha.
12Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, ka ha soro nchepụta nke echiche ha.
13“Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile.