14Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha. Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile.
15Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ. Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi.
16Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”