Abụ Ọma 89

Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.

Psalm 89:10 (UKJV) You have broken Rahab in pieces, as one that is slain; you have scattered yours enemies with your strong arm.

8O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.

9Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.

10Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.

11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.

12Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.