Abụ Ọma 89

Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.

Psalm 89:11 (UKJV) The heavens are yours, the earth also is yours: as for the world and the fullness thereof, you have founded them.

9Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.

10Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.

11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.

12Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.

13Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.