10Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.
11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.
12Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.
13Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.
14Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.