14Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.
15Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.
16Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile; ha na-aṅụrị nʼezi omume gị.
17Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu.
18Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị, eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel.