19I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ, nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị: “Enyela m otu onye dị ike agha ike; Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m.
20Achọtala m Devid ohu m, were mmanụ nsọ m tee ya.
21Aka m ga-agba ya ume; nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike.
22Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya.
23Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya. Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi.