21Aka m ga-agba ya ume; nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike.
22Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya.
23Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya. Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi.
24Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu.
25M ga-edo aka ya nʼoke osimiri, dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.