24Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu.
25M ga-edo aka ya nʼoke osimiri, dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.
26Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’
27Aga m eme ya nwa mbụ m, onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ.
28Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.