Abụ Ọma 89

I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ.

Psalm 89:42 (UKJV) You have set up the right hand of his adversaries; you have made all his enemies to rejoice.

40Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa.

41Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere. Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo.

42I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ.

43I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, i nyereghị ya aka mgbe agha dara.

44I meela ka ịma mma ya gwụsịa. Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.