46Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị? Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ?
47Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile!
48Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? Sela
49O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?
50Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya, otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile.