48Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? Sela
49O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?
50Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya, otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile.
51O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo, nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ.
52Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi. Amen na Amen.