Abụ Ọma 9

Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke.

Psalm 9:17 (UKJV) The wicked shall be turned into hell, and all the nations that forget God.

15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.

16Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi; ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela

17Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke.

18Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa; olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.

19O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ; ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.