14ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị nʼọnụ ụzọ ama niile nke ada Zayọn, nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.
15Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.
16Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi; ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. Sela
17Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke.
18Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa; olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.