6ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ, ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa.
7E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị; anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị.
8Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị. Ị na-ahụzukwa mmehie nzuzo anyị niile.
9Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị; afọ ndụ anyị nke fọdụrụ ka anyị na-ebi dịka okwu e ji nwayọọ kwuo na mwute.
10Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa, maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide, ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude, nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa.