4Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ.
5Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị; ha na-emegbu ihe nketa gị.
6Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa; ha na-egbu ndị na-enweghị nna.
7Ha na-asị, “Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a; Chineke Jekọb na-agba nkịtị.”
8Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?