11Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya.
12Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ.
13Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa, ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe, jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.