Abụ Ọma 98

Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.

Psalm 98:2 (UKJV) The LORD has made known his salvation: his righteousness has he openly showed in the sight of the heathen.

1Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta.

2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.

3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.

4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.