13Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya.
14Isi ya na agịrị isi ya na-acha vaa dịka ogho ọcha, dịka akụmmiri igwe. Anya ya abụọ yiri ire ọkụ na-enwusi ike.
15Ụkwụ ya abụọ dị ka bronz a nụchasịrị nnọọ nke ọma hichapụkwa ya. Olu okwu ya na-ada dị ka ụzụ mmiri na-achị achị.
16O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile.
17Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala nʼụkwụ ya dịka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nʼahụ na-ekwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ.