15Ụkwụ ya abụọ dị ka bronz a nụchasịrị nnọọ nke ọma hichapụkwa ya. Olu okwu ya na-ada dị ka ụzụ mmiri na-achị achị.
16O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile.
17Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala nʼụkwụ ya dịka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nʼahụ na-ekwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ.
18Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ.
19“Ya mere, detuo ihe niile ị hụrụla, ihe dị ugbu a na ihe gaje ime na mgbe na adịghị anya.