Mkpughe 1

Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ.

Revelation 1:18 (UKJV) I am he that lives, and was dead; and, behold, I am alive for evermore, Amen; and have the keys of hell and of death.

16O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile.

17Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala nʼụkwụ ya dịka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nʼahụ na-ekwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ.

18Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ.

19“Ya mere, detuo ihe niile ị hụrụla, ihe dị ugbu a na ihe gaje ime na mgbe na adịghị anya.

20Nke a bụ ihe omimi nke kpakpando asaa ahụ ị hụrụ nʼaka nri m, na ihe ịdọba oriọna asaa ndị ahụ pụtara. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi ụlọ nzukọ asaa ahụ. Osisi oriọna asaa ahụ bụ ụlọ nzukọ ndị ahụ nʼonwe ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.