1Mkpughe banyere Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere ya igosi ndị ohu ya, ime ka ha mata ihe ndị ahụ na-aga ime nʼoge na-adịghị anya. O mere ka amata nke a site na izite mmụọ ozi ya ka ọ bịakwute ohu ya Jọn,
2onye a gbara ama banyere ihe niile ọ hụrụ, okwu Chineke, na ọgbụgba ama Jisọs Kraịst.
3Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-agụpụta okwu ndị a dị nʼamụma a. Ngọzị na-adịkwara ndị na-anụ ya, ma nabata ihe e dere nʼime ya nʼobi ha. Nʼihi na oge mmezu ha dị nso.
4Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a, Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa: Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya,
5sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie.