Mkpughe 15

Ahụrụ m ihe dịka oke osimiri enyo a gwakọtara ya na ọkụ, na ndị ahụ nweterala mmeri nʼebe anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya, na ọnụọgụgụ aha ya. Ha guzo nʼakụkụ oke osimiri enyo ahụ, jidekwa ụbọ akwara nke Chineke nʼaka ha.

Revelation 15:2 (UKJV) And I saw as it were a sea of glass mingled with fire: and them that had got the victory over the beast, and over his image, and over his mark, and over the number of his name, stand on the sea of glass, having the harps of God.

1Ahụkwara m ihe ịrịbama ọzọ nʼeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ndị mmụọ ozi asaa ji ụzọ ahụhụ asaa. Ha bụ ahụhụ nke ikpeazụ ndị ga-eweta iwe Chineke na ngwụcha.

2Ahụrụ m ihe dịka oke osimiri enyo a gwakọtara ya na ọkụ, na ndị ahụ nweterala mmeri nʼebe anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya, na ọnụọgụgụ aha ya. Ha guzo nʼakụkụ oke osimiri enyo ahụ, jidekwa ụbọ akwara nke Chineke nʼaka ha.

3Ha na-abụ abụ Mosis ohu Chineke, na abụ Nwa atụrụ ahụ. “Ọrụ gị niile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ụzọ gị niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Gị, Eze nke mba niile.

4Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị, onye ga-agharakwa ito aha gị? Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ. Mba niile ga-abịakwa ịkpọ isiala nʼihu gị, nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.