Mkpughe 16

Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu iyi na nʼelu isi iyi niile. Nke a mere ka ha niile ghọọ ọbara.

Revelation 16:4 (UKJV) And the third angel poured out his vial upon the rivers and fountains of waters; and they became blood.

2Mmụọ ozi nke mbụ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ụwa, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị mmadụ niile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị na-akpọrọ oyiyi ya isiala.

3Mmụọ ozi nke abụọ wụsara ihe dị nʼime efere nke ya nʼelu osimiri niile. Otu mgbe ahụ, osimiri niile chagharịrị ghọọ ọbara dịka nke onye nwụrụ anwụ. Nke a mere ka ihe niile dị ndụ nʼime osimiri ahụ nwụọ.

4Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu iyi na nʼelu isi iyi niile. Nke a mere ka ha niile ghọọ ọbara.

5Anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri niile dị nʼaka ya kwuru okwu sị, “I kpere ikpe ziri ezi, Gị, Onye dị Nsọ, na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a.

6Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị. Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.