3Mmụọ ozi nke abụọ wụsara ihe dị nʼime efere nke ya nʼelu osimiri niile. Otu mgbe ahụ, osimiri niile chagharịrị ghọọ ọbara dịka nke onye nwụrụ anwụ. Nke a mere ka ihe niile dị ndụ nʼime osimiri ahụ nwụọ.
4Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu iyi na nʼelu isi iyi niile. Nke a mere ka ha niile ghọọ ọbara.
5Anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri niile dị nʼaka ya kwuru okwu sị, “I kpere ikpe ziri ezi, Gị, Onye dị Nsọ, na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a.
6Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị. Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.”
7Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nʼebe ịchụ aja sịrị, “E, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, ikpe gị niile bụ nke ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.”