6Nʼihi na ha wụsara ọbara ndị nsọ gị na ndị amụma gị. Ma ugbu a, i nyela ha ọbara ka ha ṅụọ. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesiri ịnata.”
7Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nʼebe ịchụ aja sịrị, “E, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, ikpe gị niile bụ nke ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.”
8Mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu anyanwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo ndị mmadụ.
9Okpomọkụ ahụ si nʼanyanwụ bịa rere onye ọbụla ọkụ nʼahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye nwere ike ịchị ihe otiti ndị a, ma ha jụrụ ichegharị nye ya otuto.
10Mmụọ ozi nke ise pụrụ wụkwasị ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ocheeze anụ ọhịa ahụ, mee ka alaeze ya jupụta nʼọchịchịrị. Ndị mmadụ tabiri ire ha nʼihi oke ahụ ụfụ.