7Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nʼebe ịchụ aja sịrị, “E, Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, ikpe gị niile bụ nke ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.”
8Mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu anyanwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo ndị mmadụ.
9Okpomọkụ ahụ si nʼanyanwụ bịa rere onye ọbụla ọkụ nʼahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye nwere ike ịchị ihe otiti ndị a, ma ha jụrụ ichegharị nye ya otuto.
10Mmụọ ozi nke ise pụrụ wụkwasị ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ocheeze anụ ọhịa ahụ, mee ka alaeze ya jupụta nʼọchịchịrị. Ndị mmadụ tabiri ire ha nʼihi oke ahụ ụfụ.
11Ha kọchara Chineke nke eluigwe nʼihi ihe ụfụ na ọnya bịakwasịrị ha. Ma ha jụrụ ichegharị site nʼajọ ọrụ ha niile.