Mkpughe 17

Ise nʼime ha adaala, otu ka nọ, nke ọzọ abịabeghị. Mgbe ọ bịara, ọ ga-anọ nwantakịrị oge.

Revelation 17:10 (UKJV) And there are seven kings: five are fallen, and one is, and the other is not yet come; and when he comes, he must continue a short space.

8Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa.

9“Nke a chọrọ uche nke nwere amamihe. Isi asaa ahụ nọchiri anya ugwu asaa ahụ nke nwanyị ahụ na-anọdụ nʼelu ha. Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa.

10Ise nʼime ha adaala, otu ka nọ, nke ọzọ abịabeghị. Mgbe ọ bịara, ọ ga-anọ nwantakịrị oge.

11Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi.

12“Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.