Mkpughe 17

“Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa.

Revelation 17:12 (UKJV) And the ten horns which you saw are ten kings, which have received no kingdom as yet; but receive power as kings one hour with the beast.

10Ise nʼime ha adaala, otu ka nọ, nke ọzọ abịabeghị. Mgbe ọ bịara, ọ ga-anọ nwantakịrị oge.

11Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi.

12“Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa.

13Ha ji otu obi na-enye anụ ọhịa ahụ ike ha na ịchị isi ha.

14Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.