Mkpughe 17

Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.”

Revelation 17:14 (UKJV) These shall make war with the Lamb, and the Lamb shall overcome them: for he is Lord of lords, and King of kings: and they that are with him are called, and chosen, and faithful.

12“Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa.

13Ha ji otu obi na-enye anụ ọhịa ahụ ike ha na ịchị isi ha.

14Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.”

15Mgbe ahụ ọ sịrị m, “Mmiri ndị ahụ ị hụrụ, ebe nwanyị akwụna ahụ nọ, bụ ndị mmadụ dị iche iche, igwe mmadụ, na mba dị iche iche na nʼasụsụ dị iche iche.

16Anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị. Ha ga-agba ya ọtọ, laakwa ya nʼiyi, ha ga-eri anụ ya, werekwa ọkụ rechapụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.