Mkpughe 17

Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi.

Revelation 17:11 (UKJV) And the beast that was, and is not, even he is the eighth, and is of the seven, and goes into perdition.

9“Nke a chọrọ uche nke nwere amamihe. Isi asaa ahụ nọchiri anya ugwu asaa ahụ nke nwanyị ahụ na-anọdụ nʼelu ha. Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa.

10Ise nʼime ha adaala, otu ka nọ, nke ọzọ abịabeghị. Mgbe ọ bịara, ọ ga-anọ nwantakịrị oge.

11Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi.

12“Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa.

13Ha ji otu obi na-enye anụ ọhịa ahụ ike ha na ịchị isi ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.