26Ma onye ọbụla na-emeri emeri, na-anọgidekwa na-eme uche m ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka m ga-enye ikike nʼebe mba niile nọ.
27Onye ahụ, ‘ga-eji mkpara igwe chịa ha, dịka mgbe a kụwachara ite aja na mpekele na mpekele.’ Ọ bụladị ka Nna m si nye m ike,
28a ga-enye onye nke meririnụ kpakpando ụtụtụ.
29Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.